Native Bible

2 Chronicles 18:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ugbu a, Jehoshafat nwere akụnụba na ugwu buru ibu, bịakwa ghọọ ọgọ Ehab.

2 Chronicles 18:1 in English

2 Chronicles 18:1 · Berean Standard Bible

Now Jehoshaphat had riches and honor in abundance, and he allied himself with Ahab by marriage.

Context

1Ugbu a, Jehoshafat nwere akụnụba na ugwu buru ibu, bịakwa ghọọ ọgọ Ehab. 2Mgbe afọ ole na ole gasịrị, Jehoshafat gara Sameria ileta Ehab. Ehab gbuuru ya na ndị ya na ha yi ọtụtụ atụrụ na ehi, ọ kpọrọ oriri kwagide ya ka o buso Ramọt Gilead agha. 3Ehab eze Izrel jụrụ Jehoshafat eze Juda, sị, “Ị ga-eso m buso Ramọt Gilead agha?” Jehoshafat zaghachiri, “Otu m dị ka gị onwe gị dị, ndị nke m bụkwa ndị gị. Anyị ga-eso gị gaa agha.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.