2 Ihe E Mere 17:6
2 Chronicles 17:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O ji obi ya niile gbasoo ụzọ Onyenwe anyị. Ọzọkwa, o sitere na Juda wezuga ebe niile dị elu nakwa ogidi Ashera niile.
2 Chronicles 17:6 in English
2 Chronicles 17:6 · Berean Standard Bible
And his heart took delight * in the ways of the LORD; furthermore, he removed the high places and Asherah poles from Judah.
Context
4kama ọ chọrọ Onyenwe anyị, Chineke nna ya, dobekwa iwu ya niile, ọ bụghịkwa dịka omume ndị Izrel si dị. 5Nʼihi nke a Onyenwe anyị mere ka ọchịchị ya guzosie ike. Ndị Juda niile tụkwara ụtụ ha dịka o kwesiri wetara Jehoshafat, nke a mere ka o nwee akụnụba ebe ọ dị ukwuu, nwekwa nsọpụrụ. 6O ji obi ya niile gbasoo ụzọ Onyenwe anyị. Ọzọkwa, o sitere na Juda wezuga ebe niile dị elu nakwa ogidi Ashera niile. 7Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị ya, o zipụrụ ndịisi ọchịchị alaeze ya ndị a, Ben-Hail, Ọbadaya, Zekaraya, Netanel na Mikaya ka ha gaa zie ndị mmadụ ihe nʼobodo niile nke Juda. 8Ụfọdụ ndị Livayị ndị a sokwa gaa: Shemaya, Netanaya, Zebadaya, Asahel, Shemiramot, Jehonatan, Adonaịja, Tobaija, Tob-Adonaịja na ndị nchụaja ụfọdụ, ndị dị ka Elishama na Jehoram.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.