2 Ihe E Mere 17:4
2 Chronicles 17:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
kama ọ chọrọ Onyenwe anyị, Chineke nna ya, dobekwa iwu ya niile, ọ bụghịkwa dịka omume ndị Izrel si dị.
2 Chronicles 17:4 in English
2 Chronicles 17:4 · Berean Standard Bible
but he sought the God of his father and walked by His commandments rather than the practices of Israel.
Context
2O tinyere ụfọdụ ndị agha ya nʼobodo niile dị na Juda e wusiri ike, tinyekwa ụfọdụ nʼobodo ndị ọzọ dị nʼIfrem, na ebe ndị ọzọ niile nke nna ya, Asa meriri nʼagha. 3Onyenwe anyị nọnyeere Jehoshafat nʼihi na o sooro nzọ ụkwụ nna ya, bụ Devid, onye buuru ya ụzọ chịa. Ọ jụghị ase site nʼaka Baal, 4kama ọ chọrọ Onyenwe anyị, Chineke nna ya, dobekwa iwu ya niile, ọ bụghịkwa dịka omume ndị Izrel si dị. 5Nʼihi nke a Onyenwe anyị mere ka ọchịchị ya guzosie ike. Ndị Juda niile tụkwara ụtụ ha dịka o kwesiri wetara Jehoshafat, nke a mere ka o nwee akụnụba ebe ọ dị ukwuu, nwekwa nsọpụrụ. 6O ji obi ya niile gbasoo ụzọ Onyenwe anyị. Ọzọkwa, o sitere na Juda wezuga ebe niile dị elu nakwa ogidi Ashera niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.