2 Ihe E Mere 17:12
2 Chronicles 17:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Jehoshafat ghọrọ eze dị ike. O wusiri obodo ndị dị na Juda ike, wukwaa obodo ịchịkọba ihe.
2 Chronicles 17:12 in English
2 Chronicles 17:12 · Berean Standard Bible
Jehoshaphat grew stronger and stronger, and he built fortresses and store cities in Judah
Context
10Egwu Onyenwe anyị dakwasịrị alaeze niile dị gburugburu Juda, nʼihi ya, ha ebukwaghị agha megide Jehoshafat. 11Ụfọdụ nʼime ndị Filistia wetaara ya onyinye na ọlaọcha kwa afọ nʼụzọ ịkwanyere ya ugwu, ma ndị Arab, wetaara ya igwe anụ ụlọ dị puku ebule asaa na narị asaa, na puku mkpi asaa na narị asaa. 12Ya mere, Jehoshafat ghọrọ eze dị ike. O wusiri obodo ndị dị na Juda ike, wukwaa obodo ịchịkọba ihe. 13O nwekwara ihe ndị ọ chịkọbara nʼọtụtụ obodo Juda. O debekwara ndị agha ibu agha doro anya nʼime Jerusalem. 14Ngụkọta ha dịka e si dekọọ ya nʼezinaụlọ si dị:
Ndị si Juda, ndịisi agha na-achị puku ndị agha (1,000),
Adna, onyeisi agha, na-achị narị puku ndị agha atọ (300,000),
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.