2 Ihe E Mere 15:3
2 Chronicles 15:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọtụtụ oge dị anya ndị Izrel nọ na-enweghị Chineke nke ezie, ha enweghịkwa onye nchụaja ga-ezi ihe, ha enweghịkwa iwu Chineke
2 Chronicles 15:3 in English
2 Chronicles 15:3 · Berean Standard Bible
For many years Israel has been without the true God, without a priest to instruct them, and without the law.
Context
1Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị Azaraya nwa Oded. 2Ọ pụrụ jekwuru Asa sị ya, “Geenụ m ntị, gị Asa na ndị Juda niile na Benjamin. Onyenwe anyị ga-anọnyere unu oge niile unu na-eme okwu ya. Unu ga-achọta ya mgbe ọbụla unu chọrọ ya. Ma ọ ga-agbakụta unu azụ oge ọbụla unu nupuru isi nʼiwu ya.* 3Ma ọtụtụ oge dị anya ndị Izrel nọ na-enweghị Chineke nke ezie, ha enweghịkwa onye nchụaja ga-ezi ihe, ha enweghịkwa iwu Chineke 4Ma mgbe ọbụla ha chigharịkwutere Onyenwe anyị, Chineke Izrel tikuo ya nʼime mkpagbu ha, ọ na-enyere ha aka. 5Nʼoge ahụ, ọ dịghị udo dịrị onye ọbụla na-apụ apụ ịgagharị nʼobodo, maka na ndị niile bi nʼala ahụ nọ nʼọnọdụ oke ọgbaaghara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.