2 Ihe E Mere 12:9
2 Chronicles 12:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Shishak eze Ijipt busoro Jerusalem nʼagha; o bukọrọ akụ niile dị nʼime ụlọ Onyenwe anyị, na akụ niile dịkwa nʼụlọeze. Ọ kwakọọrọ ihe niile, werekwa ọta ọlaedo ndị ahụ Solomọn kpụrụ.
2 Chronicles 12:9 in English
2 Chronicles 12:9 · Berean Standard Bible
So King Shishak of Egypt attacked Jerusalem and seized the treasures of the house of the LORD and of the royal palace. He took everything, including the gold shields that Solomon had made.
Context
7Mgbe Onyenwe anyị hụrụ otu ha si weda onwe ha nʼala, okwu Onyenwe anyị bịakwutere Shemaya, sị, “Ebe ọ bụ na ha ewedala onwe ha nʼala, agakwaghị m ebibi ha kama aga m eme ka ha nwe nzọpụta ngwangwa. Agakwaghị m eji Shishak gosi Jerusalem oke iwe m. 8Ma otu ọ dị, ha ga-abụrụ ya ohu, ka ha nwe ike mata ọ dị iche dị nʼetiti ijere m ozi na ijere ndị eze ala ọzọ dị iche iche ozi.” 9Mgbe Shishak eze Ijipt busoro Jerusalem nʼagha; o bukọrọ akụ niile dị nʼime ụlọ Onyenwe anyị, na akụ niile dịkwa nʼụlọeze. Ọ kwakọọrọ ihe niile, werekwa ọta ọlaedo ndị ahụ Solomọn kpụrụ. 10Ma eze Rehoboam kpụrụ ọta bronz i ji dochie ndị ahụ, nyefee ha nʼaka ndịisi ndị nche, bụ ndị na-eche nʼọnụ ụzọ ụlọeze nche ka a lekọta ha anya. 11Mgbe ọbụla eze na-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị nche na-eso ya buru ọta ndị ahụ, emesịa, ha na-ebughachikwa ha nʼime ụlọ ndị nche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.