2 Ihe E Mere 12:15
2 Chronicles 12:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Rehoboam, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ nke Shemaya onye amụma na nke Ido onye ọhụ ụzọ, nke na-ahụ maka ihe banyere usoro ọmụmụ niile? Agha dịgidere nʼetiti Rehoboam na Jeroboam ụbọchị niile nke ndụ ha.
2 Chronicles 12:15 in English
2 Chronicles 12:15 · Berean Standard Bible
Now the acts of Rehoboam, from first to last, are they not written in the records of Shemaiah the Prophet and of Iddo the Seer concerning the genealogies? There was war between Rehoboam and Jeroboam throughout their days.
Context
13Eze Rehoboam mere onwe ya ka ọ dị ike na Jerusalem na-achịkwa ka eze. Ọ gbara iri afọ anọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị afọ iri na asaa na Jerusalem, bụ obodo ahụ Onyenwe anyị họọrọ site nʼetiti ebo niile nke Izrel, bụ ebe ọ ga-akpọkwasị Aha ya. Aha nne ya bụ Naama, onye Amọn. 14O mere ihe ọjọọ, nʼihi na ọ dịghị mgbe ọbụla o kpebiri nʼobi ya ịchọ Onyenwe anyị. 15Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Rehoboam, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ nke Shemaya onye amụma na nke Ido onye ọhụ ụzọ, nke na-ahụ maka ihe banyere usoro ọmụmụ niile? Agha dịgidere nʼetiti Rehoboam na Jeroboam ụbọchị niile nke ndụ ha. 16Rehoboam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Abija nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
12:1 Izrel nʼebe a na-ekwu maka ndị Juda, otu a ka ọ dịkwa nʼakwụkwọ 2Ih.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.