2 Ihe E Mere 11:2
2 Chronicles 11:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma okwu Onyenwe anyị rutere Shemaya, onye nke Chineke ntị:
2 Chronicles 11:2 in English
2 Chronicles 11:2 · Berean Standard Bible
But the word of the LORD came to Shemaiah the man of God:
Context
1Mgbe Rehoboam bịarutere Jerusalem, ọ kpọkọtara ndị ụlọ Juda niile na ndị ebo Benjamin, ha dị narị puku na iri asatọ nʼọnụọgụgụ, ụmụ okorobịa ndị tozuru ịga agha, ka ha gaa buso ụlọ Izrel agha ma weghachitekwa alaeze nʼokpuru ọchịchị Rehoboam. 2Ma okwu Onyenwe anyị rutere Shemaya, onye nke Chineke ntị: 3“Gwa Rehoboam, nwa Solomọn eze Juda, na Izrel niile nọ na Juda na Benjamin, 4Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu agakwala gaa buso ndị Izrel ibe unu agha. Laghachinụ, nwoke ọbụla nʼụlọ ya, nʼihi na ọ bụ m na-eme ihe ndị a.’ ” Ya mere, ha rubere isi nʼokwu niile nke Onyenwe anyị. Ha tụgharịrị laghachi azụ nʼịga megide Jeroboam.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.