Native Bible

2 Chronicles 1:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼabalị ụbọchị ahụ na Gibiọn, Onyenwe anyị mere ka Solomọn hụ ya anya, sị ya, “Rịọọ ihe ọbụla ị chọrọ ka m nye gị.”

2 Chronicles 1:7 in English

2 Chronicles 1:7 · Berean Standard Bible

That night God appeared to Solomon and said, “Ask, and I will give it to you!”

Context

5Ebe ịchụ aja bronz ahụ Bezalel nwa Uri, nwa Hua wuru dịkwa na Gibiọn, nʼihu ụlọ nzute Onyenwe anyị. Solomọn na ọgbakọ ahụ na-ajụta ya ase nʼebe bronz ahụ. 6Solomọn jere nʼebe ịchụ aja ahụ e ji bronz kpụọ, nke dị nʼihu Onyenwe anyị, nʼime ụlọ nzute, jiri anụ ụlọ ọnụọgụgụ ha dị otu puku chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ya. 7Nʼabalị ụbọchị ahụ na Gibiọn, Onyenwe anyị mere ka Solomọn hụ ya anya, sị ya, “Rịọọ ihe ọbụla ị chọrọ ka m nye gị.” 8Ma Solomọn zara Chineke, sị, “I gosila nna m bụ Devid obi ebere dị ukwuu. Ugbu a, i meekwala m eze nʼọnọdụ ya 9Ugbu a, Onyenwe anyị bụ Chineke, ka nkwa gị nke i kwere nna m, bụ Devid, bụrụ ihe e mezuru, nʼihi na ị meela m eze ndị a bara ụba nʼọnụọgụgụ dịka aja nke ala.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.