Native Bible

1 Timothy 5:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mmehie ụfọdụ mmadụ na-apụta ihe ma na-ebukwa ha ụzọ rụọ oche ikpe, ma ndị ọzọ ka a na-ahụta mmehie ha nʼoge ikpeazụ.

1 Timothy 5:24 in English

1 Timothy 5:24 · Berean Standard Bible

The sins of some men are obvious, going ahead of them to judgment; but the sins of others do not surface until later.

Context

22Ebikwasịkwala onye ọbụla aka nʼisi ọsịịsọ ime ya okenye maọbụ onye na-eje ozi. Ekwela ka i keta oke na mmehie ndị ọzọ. Debe onwe gị ọcha. 23Aṅụkwala naanị mmiri ọzọ, na-aṅụ ntakịrị mmanya maka afọ gị na nrịa nrịa nke na-arịa gị ọtụtụ mgbe. 24Mmehie ụfọdụ mmadụ na-apụta ihe ma na-ebukwa ha ụzọ rụọ oche ikpe, ma ndị ọzọ ka a na-ahụta mmehie ha nʼoge ikpeazụ. 25Otu a kwa, ọrụ ọma na-apụta ihe, ma ọ bụladị ndị na-apụtaghị ihe, apụghị izo ha ezo. 5:18 Dit 25:4 5:18 Luk 10:7

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.