Native Bible

1 Timothy 5:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru, “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka,”* hapụ ya ka ọ na-eri nri mgbe ọ na-arụ ọrụ, ọzọkwa, “Onye na-arụ ọrụ kwesiri ịnata ụgwọ ọrụ ya.”*

1 Timothy 5:18 in English

1 Timothy 5:18 · Berean Standard Bible

For the Scripture says, “Do not muzzle an ox while it is treading out the grain,”* and, “The worker is worthy of his wages.”*

Context

16Ya mere, nwanyị ọbụla kwere ekwe, nke nwere nʼezinaụlọ ya ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, ya jisie ike gboro ha mkpa. Ọ dịghị mma ibogbu chọọchị nʼibu, ka o nwee ike iletazu ndị nọ nʼọnọdụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ nʼezie. 17Nye ndị okenye, ndị na-achị nke ọma nsọpụrụ kwesiri ekwesi na ụgwọ ọrụ okpukpu abụọ, ọkachasị ndị na-adọgbu onwe ha nʼọrụ izi oziọma na nʼikuzi ihe. 18Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru, “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka,”* hapụ ya ka ọ na-eri nri mgbe ọ na-arụ ọrụ, ọzọkwa, “Onye na-arụ ọrụ kwesiri ịnata ụgwọ ọrụ ya.”* 19Egela ntị nʼebubo ọjọọ ọbụla a na-ebo onye okenye karịakwa maọbụ na ndị akaebe abụọ maọbụ atọ gbara ama megide ya. 20Ma ndị okenye ahụ nọgidere na-eme mmehie, kpọpụta ha baara ha mba nʼihu mmadụ niile, ka ndị ọzọ tụọ egwu gharakwa iso omume ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.