1 Timoti 3:9
1 Timothy 3:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-abụ ndị ji akọnuche dị ọcha na-ejidesi eziokwu nke okwukwe anyị ike.
1 Timothy 3:9 in English
1 Timothy 3:9 · Berean Standard Bible
They must hold to the mystery of the faith with a clear conscience.
Context
7Ọ ga-abụkwa onye nwere ezi ama nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, ka ọ ghara ịdaba nʼọnọdụ ihere nakwa nʼọnya ekwensu. 8Otu ahụ kwa, ndị a họpụtara ijere chọọchị ozi aghaghị ịbụ ndị kwesiri nsọpụrụ, ndị na-enweghị ire abụọ,* ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ha agaghị abụ ndị na-aṅụbiga mmanya oke na ndị akpịrị ego na-agbaso uru nʼezighị ezi. 9Ha ga-abụ ndị ji akọnuche dị ọcha na-ejidesi eziokwu nke okwukwe anyị ike. 10Tupu a họpụta ha ịrụ ọrụ a, a ga-ebu ụzọ nwalee ha. Ọ bụrụ na ha enweghị ebubo ọbụla megide ha, mgbe ahụ, a ga-eme ha ndị na-eje ozi na chọọchị. 11Otu aka ahụ kwa, ndị nwanyị kwesikwara ịbụ ndị nwere nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla, ndị na-adịghị ebu iro nʼobi, ndị na-adịghị agba asịrị, kama ndị nwere obi umeala, na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼihe niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.