Native Bible

1 Timothy 3:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

(Nʼihi na ọ bụrụ na mmadụ enweghị ike chịkọtazie ezinaụlọ ya, ọ ga-esi aṅaa chịzie chọọchị Chineke?)

1 Timothy 3:5 in English

1 Timothy 3:5 · Berean Standard Bible

For if someone does not know how to manage his own household, how can he care for the church of God?

Context

3Ọ gaghị abụ onye na-aṅụbiga mmanya oke, ọ gaghị abụ onye na-alụkarị ọgụ, kama ọ ga-abụ onye dị nwayọọ, onye na-ahụghị okwu na ụka nʼanya, na onye na-adịghị ahụ ego nʼanya. 4Ọ ga-abụ onye na-achịzi ezinaụlọ ya nke ọma, bụrụkwa onye na-achịkwa ụmụ ya inwe nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla. 5(Nʼihi na ọ bụrụ na mmadụ enweghị ike chịkọtazie ezinaụlọ ya, ọ ga-esi aṅaa chịzie chọọchị Chineke?) 6Ọ gaghị abụ onye chegharịrị ọhụrụ, ma ọ bụghị ya, ọ ga-afụlị onwe ya elu nʼịnya isi, ma si otu a daba nʼọmụma ikpe dị ka ekwensu. 7Ọ ga-abụkwa onye nwere ezi ama nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, ka ọ ghara ịdaba nʼọnọdụ ihere nakwa nʼọnya ekwensu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.