1 Ndị Tesalonaịka 5:9
1 Thessalonians 5:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na Chineke akwadebeghị ikpe ọmụma na egwu nye anyị. Kama ka anyị nweta nzọpụta site nʼokwukwe anyị nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
1 Thessalonians 5:9 in English
1 Thessalonians 5:9 · Berean Standard Bible
For God has not appointed us to suffer wrath, but to obtain salvation through our Lord Jesus Christ.
Context
7Nʼihi na abalị bụ mgbe ndị na-arahụ ụra ji arahụ ụra. Ọ bụkwa nʼabalị ka ndị mmanya na-egbu na-aṅụbiga mmanya oke. 8Ma ebe anyị niile bụ ndị nke ihe, ka anyị bụrụ ndị anya doro, ndị yi okwukwe na ịhụnanya dịka ihe ikpuchi obi, yikwasịkwa olileanya nke nzọpụta dị ka okpu igwe. 9Nʼihi na Chineke akwadebeghị ikpe ọmụma na egwu nye anyị. Kama ka anyị nweta nzọpụta site nʼokwukwe anyị nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. 10Ọ nwụrụ nʼihi anyị ka ọ bụrụ, ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị ga-esoro ya dịrị ndụ. 11Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.