1 Ndị Tesalonaịka 2:16
1 Thessalonians 2:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
site nʼigbochi anyị izisara ndị mba ọzọ oziọma ka a ghara ịzọpụta ha. Ha na-esite nʼụzọ dị otu a na-eme ka iko mmehie ha na-eju. Ma ikpe Chineke adakwasịlarị ha.
1 Thessalonians 2:16 in English
1 Thessalonians 2:16 · Berean Standard Bible
hindering us from telling the Gentiles how they may be saved. As a result, they continue to heap up their sins to full capacity; the utmost wrath has come upon them.*
Context
14Unu onwe unu, ụmụnna m, ghọọnụ ndị na-eṅomi nzukọ nke Chineke nʼime Kraịst Jisọs, ndị nọ na Judịa. Nʼihi na unu onwe unu hụkwara otu ụdị ahụhụ ahụ nʼaka ndị ala unu, dị ka ha onwe ha hụrụ nʼaka ndị Juu. 15Ndị gburu ndị amụma, gbukwaa Onyenwe anyị Jisọs. Ugbu a ha na-akpagbukwa anyị na-achụpụ anyị. Ha na-emegide Chineke na mmadụ niile 16site nʼigbochi anyị izisara ndị mba ọzọ oziọma ka a ghara ịzọpụta ha. Ha na-esite nʼụzọ dị otu a na-eme ka iko mmehie ha na-eju. Ma ikpe Chineke adakwasịlarị ha. 17Otu ọ dị, ụmụnna anyị, mgbe anyị si nʼetiti unu pụọ, nọọ nwa oge nta, ọnọdụ a mere anyị ndị na-enweghị nne na nna (maọbụ na-anụ ahụ ọ bụghị nʼime mmụọ), nʼihi otu unu si gụọ anyị agụụ, anyị gbalịrị ihu unu. 18Anyị gbalịsịrị ike ịbịakwute unu, karịsịa, mụ onwe m bụ Pọl gbalịrị, gbalịa ịbịa, ma ekwensu gbochiri anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.