Native Bible

1 Thessalonians 2:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị gburu ndị amụma, gbukwaa Onyenwe anyị Jisọs. Ugbu a ha na-akpagbukwa anyị na-achụpụ anyị. Ha na-emegide Chineke na mmadụ niile

1 Thessalonians 2:15 in English

1 Thessalonians 2:15 · Berean Standard Bible

who killed both the Lord Jesus and their own prophets, and drove us out as well. They are displeasing to God and hostile to all men,

Context

13Nʼihi nke a, anyị ga-aga nʼihu na-ekele Chineke na-esepụghị aka, nʼihi na mgbe unu nabatara okwu Chineke, bụ nke unu nụrụ nʼọnụ anyị, unu anabataghị ya dị ka okwu mmadụ, kama otu ọ dịkwa nʼeziokwu, ya bụ okwu Chineke, nke na-arụsikwa* ọrụ ike nʼime unu bụ ndị kweere ya. 14Unu onwe unu, ụmụnna m, ghọọnụ ndị na-eṅomi nzukọ nke Chineke nʼime Kraịst Jisọs, ndị nọ na Judịa. Nʼihi na unu onwe unu hụkwara otu ụdị ahụhụ ahụ nʼaka ndị ala unu, dị ka ha onwe ha hụrụ nʼaka ndị Juu. 15Ndị gburu ndị amụma, gbukwaa Onyenwe anyị Jisọs. Ugbu a ha na-akpagbukwa anyị na-achụpụ anyị. Ha na-emegide Chineke na mmadụ niile 16site nʼigbochi anyị izisara ndị mba ọzọ oziọma ka a ghara ịzọpụta ha. Ha na-esite nʼụzọ dị otu a na-eme ka iko mmehie ha na-eju. Ma ikpe Chineke adakwasịlarị ha. 17Otu ọ dị, ụmụnna anyị, mgbe anyị si nʼetiti unu pụọ, nọọ nwa oge nta, ọnọdụ a mere anyị ndị na-enweghị nne na nna (maọbụ na-anụ ahụ ọ bụghị nʼime mmụọ), nʼihi otu unu si gụọ anyị agụụ, anyị gbalịrị ihu unu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.