1 Samuel 9:4
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha chọrọ ịnyịnya ndị ahụ gaa nʼala ugwu ugwu Ifrem, na nʼakụkụ Shalisha, ma ha ahụghị ha. Ha chọkwara ha gaa nʼakụkụ Shaalim, ma ha ahụghị ha nʼebe ahụ. Emesịa, ha chọrọ ịnyịnya ibu ndị ahụ gaa nʼala niile nke ndị Benjamin, ma ha ahụghị ha ebe ọbụla.
1 Samuel 9:4 in English
1 Samuel 9:4 · Berean Standard Bible
So Saul passed through the hill country of Ephraim and then through the land of Shalishah, but did not find the donkeys. He and the servant went through the region of Shaalim, but they were not there. Then they went through the land of Benjamin, and still they did not find them.
Context
2O nwere nwa nwoke aha ya bụ Sọl, onye bụ okorobịa nọ nʼuju ya. O nweghị nwoke ọzọ e ji atụnyere ya nʼIzrel niile. O toro ogologo karịa onye ọbụla site nʼubu ruo nʼisi. 3Otu ụbọchị, ụfọdụ nʼime ịnyịnya ibu Kish nna Sọl nwere kpafuru. Nʼihi ya, Kish kpọrọ Sọl gwa ya okwu sị, “Duru otu odibo ka gị na ya soro ga chọgharịa ịnyịnya ibu ndị a.” 4Ha chọrọ ịnyịnya ndị ahụ gaa nʼala ugwu ugwu Ifrem, na nʼakụkụ Shalisha, ma ha ahụghị ha. Ha chọkwara ha gaa nʼakụkụ Shaalim, ma ha ahụghị ha nʼebe ahụ. Emesịa, ha chọrọ ịnyịnya ibu ndị ahụ gaa nʼala niile nke ndị Benjamin, ma ha ahụghị ha ebe ọbụla. 5Nʼikpeazụ, mgbe ha chọọrọ ha rute nʼala Zuf, Sọl gwara onyeozi ahụ ya na ya so, sị, “Ka anyị laghachi, nʼihi na ọ bụrụ na nna m elee anya anyị ma ọ hụghị anyị, ọ ga-amalite iche echiche banyere anyị karịa ịnyịnya ibu ndị a.” 6Ma odibo ahụ zara ya sị, “Lee, e nwere otu onye nke Chineke bi nʼobodo a; ọ bụkwa onye mmadụ niile na-asọpụrụ nʼihi na ihe ọbụla o kwuru na-emezu. Ka anyị gaa hụ ya, ma eleghị anya ọ ga-agwa anyị ụzọ anyị ga-esi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.