Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Samuel weere nwa atụrụ na-aṅụ ara jiri ya chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ, rịọkwa Onyenwe anyị ka o nyere Izrel aka. Onyenwe anyị zara ekpere ya.

1 Samuel 7:9 in English

1 Samuel 7:9 · Berean Standard Bible

Then Samuel took a suckling lamb and offered it as a whole burnt offering to the LORD. He cried out to the LORD on behalf of Israel, and the LORD answered him.

Context

7Mgbe ndị Filistia nụrụ na ụmụ Izrel zukọrọ na Mizpa, ndị eze ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha, bịa ibuso Izrel agha. Mgbe ụmụ Izrel nụrụ na ha na-abịa nso, ha tụrụ ụjọ nke ukwuu. 8Ha sịrị Samuel, “Akwụsịla itiku Onyenwe anyị Chineke anyị mkpu akwa nʼihi anyị, kpeekwa ekpere ka ọ zọpụta anyị site nʼaka ndị Filistia.” 9Mgbe ahụ, Samuel weere nwa atụrụ na-aṅụ ara jiri ya chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ, rịọkwa Onyenwe anyị ka o nyere Izrel aka. Onyenwe anyị zara ekpere ya. 10Nʼoge ahụ, mgbe Samuel nọ na-esure aja nsure ọkụ ahụ, ndị Filistia bịaruru nso ibuso Izrel agha, ma Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe were oke olu egbe eluigwe nke dara oke ụda chụsasịa ha. O mere ka ọgbaaghara bata nʼetiti ndị Filistia. Nke a mekwara ka ụmụ Izrel kpochapụ ha, 11Ndị ikom Izrel si na Mizpa pụta chụso ndị Filistia ọsọ, na-etigbu ha nʼụzọ ruo na ndịda Bet-Ka.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.