1 Samuel 30:10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
narị ndị ikom abụọ nʼime ha enwekwaghị ike ịgafe ndagwurugwu Beso nʼihi ike ọgwụgwụ, ma Devid na narị anọ ndị ọzọ chụsoro ha.
1 Samuel 30:10 in English
1 Samuel 30:10 · Berean Standard Bible
because two hundred men were too exhausted to cross the brook. But David and four hundred men continued in pursuit.
Context
8Mgbe ahụ, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m chụso ndị a na-apụnara ndị mmadụ ihe? Ọ bụrụ na m achụso ha, aga m ejide ha?”
Onyenwe anyị zara, “E, chụso ha ọsọ, ị ga-achụkwute ha, ma nataghachikwa ihe niile ha were.” 9Mgbe ahụ, Devid na narị ndị agha isii ya bịarutere nʼọdọ mmiri Beso, ebe ha hapụrụ ụfọdụ ndị 10narị ndị ikom abụọ nʼime ha enwekwaghị ike ịgafe ndagwurugwu Beso nʼihi ike ọgwụgwụ, ma Devid na narị anọ ndị ọzọ chụsoro ha. 11Ha hụrụ otu nwokorobịa onye Ijipt nʼọhịa, duuru ya bịakwute Devid. Ha nyere ya mmiri ka ọ ṅụọ, nyekwa ya nri ka o rie. 12Ihe ha nyere ya bụ achịcha fiig,* na ụyọkọ mkpụrụ vaịnị abụọ nke a mịkpọrọ amịkpọ. Mgbe o richara ha, o nweghachiri onwe ya, nʼihi na o ribeghị nri ọbụla, maọbụ ṅụọ mmiri ọbụla ụbọchị atọ, ehihie na nʼabalị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.