Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid lụkwara nwanyị ọzọ aha ya bụ Ahinoam,* onye Jezril. Ha abụọ bụkwa ndị nwunye ya.

1 Samuel 25:43 in English

1 Samuel 25:43 · Berean Standard Bible

David had also married Ahinoam of Jezreel. So she and Abigail were both his wives.

Context

41Abigel kpuru ihu nʼala sị ya, “Lee ohu gị nwanyị, ejikeere m ijere gị ozi, na ịsacha ụkwụ ndị na-ejere onyenwe m ozi.” 42Abigel mere ngwangwa jikere, kpọrọ ụmụ agbọghọ ise na-ejere ya ozi, nọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, soro ndị ahụ Devid zitere lakwuru Devid. Otu a ka Abigel sị ghọọ nwunye Devid. 43Devid lụkwara nwanyị ọzọ aha ya bụ Ahinoam,* onye Jezril. Ha abụọ bụkwa ndị nwunye ya. 44Nʼoge a, Sọl ewerela nwa ya nwanyị Mikal, onye bụ nwunye Devid kpọnye Palti, nwa Laish, onye obodo Galim, dịka nwunye. 25:13 Onye ọbụla kee mma agha ya nʼukwu ya 25:15 Ndị a bụ ụmụ okorobịa na-ejere Devid ozi. 25:24 Gbaghara ịta ụta maọbụ ajọ omume nke ohu gị 25:43 Ahinoam bụ nwunye mbụ Devid, onye mụtara ya ọkpara mbụ ya, a na-akpọ Amnọn. 1Sa 27:3; 2Sa 3:2

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.