1 Samuel 25:42
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Abigel mere ngwangwa jikere, kpọrọ ụmụ agbọghọ ise na-ejere ya ozi, nọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, soro ndị ahụ Devid zitere lakwuru Devid. Otu a ka Abigel sị ghọọ nwunye Devid.
1 Samuel 25:42 in English
1 Samuel 25:42 · Berean Standard Bible
So Abigail hurried and got on a donkey, and attended by five of her maidens, she followed David’s messengers and became his wife.
Context
40Ndị ozi Devid bịakwutere Abigel na Kamel zie ya ozi sị, “Devid zitere anyị bịakwute gị ịlụta gị ka ị ghọọ nwunye ya.” 41Abigel kpuru ihu nʼala sị ya, “Lee ohu gị nwanyị, ejikeere m ijere gị ozi, na ịsacha ụkwụ ndị na-ejere onyenwe m ozi.” 42Abigel mere ngwangwa jikere, kpọrọ ụmụ agbọghọ ise na-ejere ya ozi, nọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, soro ndị ahụ Devid zitere lakwuru Devid. Otu a ka Abigel sị ghọọ nwunye Devid. 43Devid lụkwara nwanyị ọzọ aha ya bụ Ahinoam,* onye Jezril. Ha abụọ bụkwa ndị nwunye ya. 44Nʼoge a, Sọl ewerela nwa ya nwanyị Mikal, onye bụ nwunye Devid kpọnye Palti, nwa Laish, onye obodo Galim, dịka nwunye.
25:13 Onye ọbụla kee mma agha ya nʼukwu ya
25:15 Ndị a bụ ụmụ okorobịa na-ejere Devid ozi.
25:24 Gbaghara ịta ụta maọbụ ajọ omume nke ohu gị
25:43 Ahinoam bụ nwunye mbụ Devid, onye mụtara ya ọkpara mbụ ya, a na-akpọ Amnọn. 1Sa 27:3; 2Sa 3:2
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.