Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, obi Devid malitere ịma ya ikpe nʼihi na o bipụrụ ọnụ ọnụ uwe mwụda Sọl.

1 Samuel 24:5 in English

1 Samuel 24:5 · Berean Standard Bible

Afterward, David’s conscience was stricken because he had cut off the corner of Saul’s robe.

Context

3Mgbe ọ bịaruru nso nʼọgba atụrụ nke dị nʼụzọ ahụ, otu ọgba nkume dị nʼebe ahụ, Sọl banyere nʼime ya, ịga mposi. Devid na ndị ikom ya nọ nʼime ime ọgba nkume ahụ. 4Ndị ikom Devid sịrị ya, “Ahaa ugbu a bụ oge gị! Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenwe anyị kwuru okwu ya, mgbe ọ sịrị, ‘Aghaghị m inyefe gị onye iro gị nʼaka, ka i mee ya dịka o si masị gị.’ ” Ma Devid ji nwayọọ gaa nso ebe Sọl nọ bipụ ọnụ ọnụ uwe mwụda ya. 5Emesịa, obi Devid malitere ịma ya ikpe nʼihi na o bipụrụ ọnụ ọnụ uwe mwụda Sọl. 6Ọ gwara ndị ya na ha so okwu sị, “Onyenwe anyị ekwela na m ga-emeso nna m ukwu, onye Onyenwe anyị tere mmanụ mmeso dị otu ahụ, maọbụ na m ga-eweli aka imegide ya. Nʼihi na onye Onyenwe anyị tere mmanụ ka ọ bụ.” 7Devid sitere nʼokwu ndị a o kwuru baara ndị so ya mba. O nyeghị ha ohere ibuso Sọl agha. Emesịa, Sọl hapụrụ ọgba nkume ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.