Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu nʼime ụmụ Ahimelek nwa Ahitub, aha ya bụ Abịata gbapụrụ, gbakwuru Devid.

1 Samuel 22:20 in English

1 Samuel 22:20 · Berean Standard Bible

But one of the sons of Ahimelech son of Ahitub escaped. His name was Abiathar, and he fled to David.

Context

18Mgbe ahụ eze nyere Doeg iwu sị ya, “Gị onwe gị, chigharịa gbuo ha.” Ya mere, Doeg onye Edọm chigharịrị tigbuo ha. Nʼụbọchị ahụ, o gburu iri ndị nchụaja asatọ na ise, ndị yi uwe akwa ọcha efọọd. 19O ji mma agha jee Nob, obodo ndị nchụaja, gbuo ezinaụlọ ndị nchụaja niile, nwoke na nwanyị, na ụmụntakịrị, na ụmụ na-aṅụ ara. O gbukwara ehi na ịnyịnya ibu na atụrụ ha niile. 20Otu nʼime ụmụ Ahimelek nwa Ahitub, aha ya bụ Abịata gbapụrụ, gbakwuru Devid. 21Ọ gwara Devid na Sọl egbuola ndị nchụaja Onyenwe anyị. 22Mgbe ahụ, Devid sịrị Abịata, “Nʼụbọchị ahụ, mgbe Doeg onye Edọm nọ nʼebe ahụ, amaara m na ọ ghaghị ịgwa Sọl. Mụ onwe m kpatara ọnwụ ndị niile nke ndị ezinaụlọ nna gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.