Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid zara sị ya, “Nʼezie, anyị ekwebeghị ka ụmụ nwanyị bịa anyị nso, dịka anyị dị mbụ eme ma anyị na-eje ozi. Ndị ikom ndị a na-edo onwe ha nsọ ọ bụladị mgbe njem anyị na-adịghị nsọ ka ọfọdụzie njem nke taa.”

1 Samuel 21:5 in English

1 Samuel 21:5 · Berean Standard Bible

David answered, “Women have indeed been kept from us, as is usual when I set out. And the equipment of the young men is holy, as it is even on common missions, and all the more at this time.”

Context

3Ugbu a, olee ihe oriri i nwere? Nye m ogbe achịcha ise maọbụ ihe ọzọ i nwere.” 4Onye nchụaja ahụ zara Devid sị, “Enweghị m achịcha ana edoghị nsọ nʼebe a. Ma otu ọ dị, e nwere ụfọdụ achịcha e doro nsọ nʼebe a, ma ọ bụrụ na ụmụ okorobịa gị na ha so debere onwe ha ọcha, na-emetụghị nwanyị ahụ.”* 5Devid zara sị ya, “Nʼezie, anyị ekwebeghị ka ụmụ nwanyị bịa anyị nso, dịka anyị dị mbụ eme ma anyị na-eje ozi. Ndị ikom ndị a na-edo onwe ha nsọ ọ bụladị mgbe njem anyị na-adịghị nsọ ka ọfọdụzie njem nke taa.” 6Ebe nri ọzọ na-adịghị, onye nchụaja ahụ nyere Devid achịcha nsọ, bụ achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị, nke ewepụtara site nʼihu Onyenwe anyị nʼime ebe ịchụ aja, debekwa achịcha ọhụrụ nke e ji gbanwee nke ochie dị nʼebe ahụ. 7Ma otu onye odibo Sọl nọ nʼebe ahụ nʼụbọchị ahụ, onye e jigidere nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ Doeg, onye Edọm onyeisi ndị na-azụ anụ ụlọ Sọl.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.