1 Samuel 21:11
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ndị ozi Akish sịrị ya, “Onye a ọ bụghị Devid, eze nke ala ahụ? Ọ bụghị ya bụ isi abụ ha na-abụ mgbe ha na-ete egwu na-asị: “ ‘Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị iro ya, Devid egbukwaala iri puku kwụrụ puku ndị iro nke ya’?”
1 Samuel 21:11 in English
1 Samuel 21:11 · Berean Standard Bible
But the servants of Achish said to him, “Is this not David, the king of the land? Did they not sing about him in their dances, saying: ‘Saul has slain his thousands, and David his tens of thousands’?”
Context
9Onye nchụaja zaghachiri, “Mma agha Golaịat, onye Filistia, onye ahụ i tigburu na ndagwurugwu Ịla dị nʼebe a, a fụchiri ya nʼakwa nʼazụ efọọd. Ọ bụrụ na ị chọrọ ya, were ya, nʼihi na ọ dịghị mma agha ọzọ dị nʼebe a ma ọ bụghị nke ahụ.”
Devid sịrị, “Ọ dịghị nke dịka ya, nye m ya.” 10Nʼụbọchị ahụ, Devid gbapụrụ ọsọ site nʼebe Sọl nọ gbakwuru Akish eze ndị Gat. 11Ma ndị ozi Akish sịrị ya, “Onye a ọ bụghị Devid, eze nke ala ahụ? Ọ bụghị ya bụ isi abụ ha na-abụ mgbe ha na-ete egwu na-asị:
“ ‘Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị iro ya,
Devid egbukwaala iri puku kwụrụ puku ndị iro nke ya’?” 12Mgbe Devid nụrụ okwu ndị a, ọ tụrụ egwu ihe Akish eze Gat ga-eme ya. 13Nʼihi ya ọ gbanwere omume ya, bido ime dịka onyeisi na-adịghị mma. O bidokwara ịka akara nʼibo, bidokwa na-agụsasị ọnụ mmiri nʼahụọnụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.