1 Samuel 20:16
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jonatan na ụlọ Devid gbara ndụ. O kwuru sị, “Ka Onyenwe anyị kpee ndị iro Devid niile ikpe.”
1 Samuel 20:16 in English
1 Samuel 20:16 · Berean Standard Bible
So Jonathan made a covenant with the house of David, saying, “May the LORD hold David’s enemies accountable.”
Context
14Chetakwa, i ghaghị igosi m ịhụnanya na obi ebere Onyenwe anyị, ma ọ bụrụ na m anwụọ. 15E wezugakwala ịhụnanya gị na obi ebere gị site nʼebe ezinaụlọ m dị, ọ bụladị mgbe Onyenwe anyị bipụchara ndị iro Devid niile site nʼelu ụwa.” 16Jonatan na ụlọ Devid gbara ndụ. O kwuru sị, “Ka Onyenwe anyị kpee ndị iro Devid niile ikpe.” 17Jonatan mere ka Devid site nʼịhụnanya ọ hụrụ ya ṅụọra ya iyi. Nʼihi na Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka ọ hụrụ onwe ya. 18Mgbe ahụ, Jonatan sịrị Devid, “Echi bụ mmemme ọnwa ọhụrụ. A ga-ele anya gị, nʼihi na ọnọdụ gị ga-atọgbọrọ nʼefu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.