1 Samuel 19:22
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼikpeazụ ya onwe ya pụrụ gaa Rema, ruo nʼolulu mmiri Seku. Ọ jụrụ, “Ebee ka Samuel na Devid nọ?” Ha sịrị, “Ha nọ na Naịọt nke Rema.”
1 Samuel 19:22 in English
1 Samuel 19:22 · Berean Standard Bible
Finally, Saul himself left for Ramah and came to the large cistern at Secu, where he asked, “Where are Samuel and David?” “At Naioth in Ramah,” he was told.
Context
20ya mere, o zipụrụ ndị ikom ka ha gaa jide ya. Ma mgbe ha rutere, ha hụrụ otu ndị amụma ka ha na-ebu amụma, hụkwa Samuel ka ọ na-eguzo nʼebe ahụ dịka onyeisi ha. Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ndị ozi Sọl ahụ, mee ka ha malitekwa ibu amụma. 21Mgbe Sọl nụrụ ihe mere, o zipụkwara ndị agha ọzọ, ma ha onwe ha bukwara amụma! Otu ihe ahụ mekwara ndị o zipụrụ nke ugboro atọ. 22Nʼikpeazụ ya onwe ya pụrụ gaa Rema, ruo nʼolulu mmiri Seku. Ọ jụrụ, “Ebee ka Samuel na Devid nọ?”
Ha sịrị, “Ha nọ na Naịọt nke Rema.” 23Ya mere, Sọl gara Naịọt nke dị na Rema. Ma Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya, dịka ọ na-aga nʼụzọ ọ malitere ibu amụma tutu ruo mgbe ọ bịaruru Naịọt. 24O yipụrụ uwe ya buo amụma nʼihu Samuel. Ọ gba ọtọ dinara ala nʼebe ahụ ehihie ahụ, na abalị ahụ niile. Ọ bụ nke a mere ndị mmadụ ji sị, “Sọl ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”
19:5 Maọbụ, na e nweghị ihe o mere
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.