Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ya mere, o zipụrụ ndị ikom ka ha gaa jide ya. Ma mgbe ha rutere, ha hụrụ otu ndị amụma ka ha na-ebu amụma, hụkwa Samuel ka ọ na-eguzo nʼebe ahụ dịka onyeisi ha. Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ndị ozi Sọl ahụ, mee ka ha malitekwa ibu amụma.

1 Samuel 19:20 in English

1 Samuel 19:20 · Berean Standard Bible

he sent messengers to capture him. But when they saw the group of prophets prophesying, with Samuel leading them, the Spirit of God came upon them, and Saul’s messengers also began to prophesy.

Context

18Mgbe Devid gbara ọsọ gbalaga, ọ gakwuru Samuel na Rema, kọrọ ya ihe niile Sọl mere ya. Ya na Samuel gara biri na Naịọt. 19Ozi ruru Sọl ntị, “Devid nọ na Naịọt nʼime Rema,” 20ya mere, o zipụrụ ndị ikom ka ha gaa jide ya. Ma mgbe ha rutere, ha hụrụ otu ndị amụma ka ha na-ebu amụma, hụkwa Samuel ka ọ na-eguzo nʼebe ahụ dịka onyeisi ha. Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ndị ozi Sọl ahụ, mee ka ha malitekwa ibu amụma. 21Mgbe Sọl nụrụ ihe mere, o zipụkwara ndị agha ọzọ, ma ha onwe ha bukwara amụma! Otu ihe ahụ mekwara ndị o zipụrụ nke ugboro atọ. 22Nʼikpeazụ ya onwe ya pụrụ gaa Rema, ruo nʼolulu mmiri Seku. Ọ jụrụ, “Ebee ka Samuel na Devid nọ?” Ha sịrị, “Ha nọ na Naịọt nke Rema.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.