Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye Filistia ahụ, na-abịa nso na-apụkwute Devid, onye ahụ na-ebu ọta ya na-agakwa nʼihu ya.

1 Samuel 17:41 in English

1 Samuel 17:41 · Berean Standard Bible

Now the Philistine came closer and closer to David, with his shield-bearer before him.

Context

39Devid fanyere mma agha nʼime uwe ahụ, malite ijegharị ije, nʼihi na ọ maghị otu e si eyi uwe ndị ahụ ejegharị. Ọ dịghị anya, o gwara Sọl okwu sị, “Agaghị m eyi uwe ndị a nʼihi na o doghị m ahụ.” Ya mere, Devid yipụrụ ha. 40Emesịa, o were mkpanaka ya nʼaka ya, site nʼiyi họpụta nkume ise dị mụrụmụrụ tinye ha nʼakpa nta dị nʼime akpa onye ọzụzụ atụrụ ya. O jidere ebe ya nʼaka ya, malite ịpụkwuru onye Filistia ahụ. 41Onye Filistia ahụ, na-abịa nso na-apụkwute Devid, onye ahụ na-ebu ọta ya na-agakwa nʼihu ya. 42O lere Devid anya hụ na ọ bụ naanị nwantakịrị nwoke, onye ahụ dị mma, onye mara mma ile anya. Nʼihi ya, o ledara Devid anya. 43Ọ sịrị Devid, “Abụ m nkịta, na i ji mkpanaka na-abịakwute m?” Onye Filistia ahụ ji aha chi niile ya bụọ Devid ọnụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.