1 Samuel 17:2
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Sọl na ndị Izrel niile zukọtara maa ụlọ ikwu nke ha na ndagwurugwu Ịla. Ha doro onwe ha nʼusoro agha izute ndị Filistia.
1 Samuel 17:2 in English
1 Samuel 17:2 · Berean Standard Bible
Saul and the men of Israel assembled and camped in the Valley of Elah, arraying themselves for battle against the Philistines.
Context
1Nʼoge a, ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha ọnụ, zukọtaa nʼobodo Sokoh nke dị na Juda maka ibu agha. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼEfes Damim, nke dị nʼagbata Sokoh na Azeka. 2Mgbe ahụ, Sọl na ndị Izrel niile zukọtara maa ụlọ ikwu nke ha na ndagwurugwu Ịla. Ha doro onwe ha nʼusoro agha izute ndị Filistia. 3Ndị Filistia doro onwe ha nʼelu ugwu nʼotu akụkụ, ma ndị Izrel dokwara onwe ha nʼelu ugwu nʼakụkụ nke ọzọ. Ndagwurugwu dịkwa nʼetiti ha. 4Mgbe ahụ, otu onye ọka agha aha ya bụ Golaịat,* onye obodo Gat, sitere nʼetiti ụlọ ikwu ndị Filistia pụta. Nwoke a toro ogologo nke ukwuu; ịdị ogologo ya ga-erukwa mita atọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.