Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼoge a, ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha ọnụ, zukọtaa nʼobodo Sokoh nke dị na Juda maka ibu agha. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼEfes Damim, nke dị nʼagbata Sokoh na Azeka.

1 Samuel 17:1 in English

1 Samuel 17:1 · Berean Standard Bible

Now the Philistines gathered their forces for war at Socoh in Judah, and they camped between Socoh and Azekah in Ephes-dammim.

Context

1Nʼoge a, ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha ọnụ, zukọtaa nʼobodo Sokoh nke dị na Juda maka ibu agha. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼEfes Damim, nke dị nʼagbata Sokoh na Azeka. 2Mgbe ahụ, Sọl na ndị Izrel niile zukọtara maa ụlọ ikwu nke ha na ndagwurugwu Ịla. Ha doro onwe ha nʼusoro agha izute ndị Filistia. 3Ndị Filistia doro onwe ha nʼelu ugwu nʼotu akụkụ, ma ndị Izrel dokwara onwe ha nʼelu ugwu nʼakụkụ nke ọzọ. Ndagwurugwu dịkwa nʼetiti ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.