Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ugbu a, Mmụọ Onyenwe anyị esitela nʼime Sọl pụọ, Onyenwe anyị zitekwara mmụọ ọjọọ nke bịara na-esogbu Sọl.

1 Samuel 16:14 in English

1 Samuel 16:14 · Berean Standard Bible

After the Spirit of the LORD had departed from Saul, a spirit of distress * from the LORD began to torment him.

Context

12Ọ zigara ozi ka akpọọ ya, mee ka ọ bịa. O nwere ụcha ahụ pụrụ iche, nwee anya mara mma, dịkwa mma ile anya. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Samuel okwu sị ya, “Ọ bụ onye a, bilie tee ya mmanụ.” 13Ya mere, Samuel weere mpi ahụ mmanụ dị tee ya nʼihu ụmụnne ya. Site nʼụbọchị ahụ Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Devid nʼebe ọ dị ukwuu. Emesịa, Samuel laghachiri na Rema. 14Ugbu a, Mmụọ Onyenwe anyị esitela nʼime Sọl pụọ, Onyenwe anyị zitekwara mmụọ ọjọọ nke bịara na-esogbu Sọl. 15Ndị na-ejere Sọl ozi gwara ya okwu sị, “Lee, mmụọ ọjọọ si nʼebe Chineke nọ bịa na-enye gị nsogbu. 16Biko, ka onyenwe anyị nye ndị ohu ya nọ nʼebe a ike, ka ha gaa chọta onye maara akpọ ụbọ akwara nke ọma. Ọ ga-akpọ ụbọ akwara mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ si nʼebe Chineke nọ bịa bịakwasịrị gị, ime ka ahụ dị gị mma.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.