1 Samuel 16:13
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Samuel weere mpi ahụ mmanụ dị tee ya nʼihu ụmụnne ya. Site nʼụbọchị ahụ Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Devid nʼebe ọ dị ukwuu. Emesịa, Samuel laghachiri na Rema.
1 Samuel 16:13 in English
1 Samuel 16:13 · Berean Standard Bible
So Samuel took the horn of oil and anointed him in the presence of his brothers, and the Spirit of the LORD rushed upon David from that day forward. Then Samuel set out and went to Ramah.
Context
11Ọ jụrụ Jesi sị, “Ndị a ọ gwụchaala ụmụ ndị ikom ị mụtara?”
Jesi zara sị “O fọdụrụ ọdụdụ nwa m, ma ọ nọ nʼọhịa na-azụ atụrụ.”
Samuel sịrị, “Ziga ozi kpọlata ya, anyị agaghị anọdụ ala tutu ruo mgbe ọ bịara.” 12Ọ zigara ozi ka akpọọ ya, mee ka ọ bịa. O nwere ụcha ahụ pụrụ iche, nwee anya mara mma, dịkwa mma ile anya.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Samuel okwu sị ya, “Ọ bụ onye a, bilie tee ya mmanụ.” 13Ya mere, Samuel weere mpi ahụ mmanụ dị tee ya nʼihu ụmụnne ya. Site nʼụbọchị ahụ Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Devid nʼebe ọ dị ukwuu. Emesịa, Samuel laghachiri na Rema. 14Ugbu a, Mmụọ Onyenwe anyị esitela nʼime Sọl pụọ, Onyenwe anyị zitekwara mmụọ ọjọọ nke bịara na-esogbu Sọl. 15Ndị na-ejere Sọl ozi gwara ya okwu sị, “Lee, mmụọ ọjọọ si nʼebe Chineke nọ bịa na-enye gị nsogbu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.