1 Samuel 15:8
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O jidere Agag, eze ndị Amalek na ndụ, ma jiri mma agha gbuchapụ ndị ya niile.
1 Samuel 15:8 in English
1 Samuel 15:8 · Berean Standard Bible
He captured Agag king of Amalek alive, but devoted all the others to destruction with the sword.
Context
6Sọl zigaara ndị Ken ozi sị ha, “Sitenụ nʼetiti ndị Amalek wezuga onwe unu ka m ghara ibibikọta unu na ha. Nʼihi na unu gosiri ndị Izrel obiọma mgbe ha si nʼIjipt pụta.” Ya mere, ndị Ken sitere nʼetiti ndị Amalek wezuga onwe ha. 7Sọl busoro ndị Amalek agha site na Havila ruo Shua, nke dị nʼọwụwa anyanwụ Ijipt. 8O jidere Agag, eze ndị Amalek na ndụ, ma jiri mma agha gbuchapụ ndị ya niile. 9Ma Sọl na ndị agha ya debere Agag ndụ, debekwa atụrụ na ehi kachasị mma, na ụmụ ebule na atụrụ gbara abụba, na ihe ndị ọzọ niile mara mma. Nʼezie, ihe ọbụla dị mma nʼanya ka ha jụrụ ibibi. Ma ihe ndị ọzọ niile nke na-amasịghị ha, na nke na-abaghị uru, ka ha bibiri. 10Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị rutere Samuel ntị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.