Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Sọl busoro ndị Amalek agha site na Havila ruo Shua, nke dị nʼọwụwa anyanwụ Ijipt.

1 Samuel 15:7 in English

1 Samuel 15:7 · Berean Standard Bible

Then Saul struck down the Amalekites all the way from Havilah to Shur, which is east of Egypt.

Context

5Sọl duuru ndị agha ya gaa zoo nʼakụkụ iyi tara ata dị nso nʼobodo ndị Amalek. 6Sọl zigaara ndị Ken ozi sị ha, “Sitenụ nʼetiti ndị Amalek wezuga onwe unu ka m ghara ibibikọta unu na ha. Nʼihi na unu gosiri ndị Izrel obiọma mgbe ha si nʼIjipt pụta.” Ya mere, ndị Ken sitere nʼetiti ndị Amalek wezuga onwe ha. 7Sọl busoro ndị Amalek agha site na Havila ruo Shua, nke dị nʼọwụwa anyanwụ Ijipt. 8O jidere Agag, eze ndị Amalek na ndụ, ma jiri mma agha gbuchapụ ndị ya niile. 9Ma Sọl na ndị agha ya debere Agag ndụ, debekwa atụrụ na ehi kachasị mma, na ụmụ ebule na atụrụ gbara abụba, na ihe ndị ọzọ niile mara mma. Nʼezie, ihe ọbụla dị mma nʼanya ka ha jụrụ ibibi. Ma ihe ndị ọzọ niile nke na-amasịghị ha, na nke na-abaghị uru, ka ha bibiri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.