1 Samuel 15:21
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị agha sitere nʼihe a kwatara nʼagha were ụfọdụ atụrụ na ehi, bụ ndị kachasị mma nʼetiti ihe ndị ahụ e debere iche maka ịla ha nʼiyi, iji ha chụọrọ Onyenwe anyị Chineke gị aja na Gilgal.”
1 Samuel 15:21 in English
1 Samuel 15:21 · Berean Standard Bible
The troops took sheep and cattle from the plunder, the best of the things devoted to destruction, in order to sacrifice them to the LORD your God at Gilgal.”
Context
19Gịnị mere i geghị ntị nʼokwu Onyenwe anyị ime ihe o kwuru? Gịnị mere i ji chụrụ ihe nkwata gaa, si otu a mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị?” 20Ma Sọl sịrị ya, “Ma erubeere m Onyenwe anyị isi. Ejere m ozi ahụ Onyenwe anyị zigara m. Anwụtara m Agag eze Amalek na ndụ, ma gbuchapụ ndị Amalek niile. 21Ndị agha sitere nʼihe a kwatara nʼagha were ụfọdụ atụrụ na ehi, bụ ndị kachasị mma nʼetiti ihe ndị ahụ e debere iche maka ịla ha nʼiyi, iji ha chụọrọ Onyenwe anyị Chineke gị aja na Gilgal.” 22Ma Samuel sịrị,
“Ihe na-atọ Onyenwe anyị ụtọ ọ bụ onyinye na aja nsure ọkụ
dịka nrube isi nye ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta?
Nrube isi dị mma karịa ịchụ aja
ịṅa ntị dị mma karịa abụba ebule. 23Nʼihi na nnupu isi dịka mmehie ịgba afa,
mpako dịkwa njọ dịka ikpere arụsị.
Nʼihi na ị jụla okwu Onyenwe anyị
ya onwe ya ajụkwala gị dịka eze.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.