Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Sọl sịrị ya, “Ma erubeere m Onyenwe anyị isi. Ejere m ozi ahụ Onyenwe anyị zigara m. Anwụtara m Agag eze Amalek na ndụ, ma gbuchapụ ndị Amalek niile.

1 Samuel 15:20 in English

1 Samuel 15:20 · Berean Standard Bible

“But I did obey the LORD,” Saul replied. “I went on the mission that the LORD gave me. I brought back Agag king of Amalek and devoted the Amalekites to destruction.

Context

18Onyenwe anyị ziri gị ijere ya ozi, gwa gị sị, ‘Gaa, laa ndị ajọ omume ahụ, bụ ndị Amalek nʼiyi; buso ha agha ruo mgbe ị kpochapụrụ ha niile.’ 19Gịnị mere i geghị ntị nʼokwu Onyenwe anyị ime ihe o kwuru? Gịnị mere i ji chụrụ ihe nkwata gaa, si otu a mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị?” 20Ma Sọl sịrị ya, “Ma erubeere m Onyenwe anyị isi. Ejere m ozi ahụ Onyenwe anyị zigara m. Anwụtara m Agag eze Amalek na ndụ, ma gbuchapụ ndị Amalek niile. 21Ndị agha sitere nʼihe a kwatara nʼagha were ụfọdụ atụrụ na ehi, bụ ndị kachasị mma nʼetiti ihe ndị ahụ e debere iche maka ịla ha nʼiyi, iji ha chụọrọ Onyenwe anyị Chineke gị aja na Gilgal.” 22Ma Samuel sịrị, “Ihe na-atọ Onyenwe anyị ụtọ ọ bụ onyinye na aja nsure ọkụ dịka nrube isi nye ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta? Nrube isi dị mma karịa ịchụ aja ịṅa ntị dị mma karịa abụba ebule.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.