1 Samuel 14:5
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nkume nke dị nʼakụkụ elu elu, dị nʼihu Mikmash, nke dị nʼakụkụ ndịda dị nʼihu Geba.
1 Samuel 14:5 in English
1 Samuel 14:5 · Berean Standard Bible
One cliff stood to the north toward Michmash, and the other to the south toward Geba.
Context
3Otu nʼime ndị so Sọl bụ Ahija onye nchụaja, onye yi efọọd.* Ọ bụ nwa Ahitub, onye bụ nwanne Ịkabọdụ. Ahitub bụ nwa nwa Finehaz, onye bụ nwa Elayị, onye nchụaja Onyenwe anyị na Shaịlo. Ọ dịkwaghị onye ma na Jonatan apụọla. 4Tupu Jonatan eruo ebe ndị Filistia nọ, ọ ghaghị isite na nwa ụzọ warawara dị nʼagbata nkume abụọ, a na-akpọ Bozez na Sene gabiga. 5Nkume nke dị nʼakụkụ elu elu, dị nʼihu Mikmash, nke dị nʼakụkụ ndịda dị nʼihu Geba. 6Jonatan gwara nwokorobịa na-ebu ihe agha ya sị, “Bịa, ka anyị gafee ga nʼebe nguzo ndị ahụ a na-ebighị ugwu, ma eleghị anya Onyenwe anyị ga-alụrụ anyị ọgụ. Nʼihi na ọ dịghị ihe pụrụ igbochi Onyenwe anyị ịzọpụta, site nʼọtụtụ mmadụ, maọbụ ole na ole.” 7Nwokorobịa ahụ zara sị ya, “Gaa nʼihu, eji m obi m na mmụọ m na-eso gị dịka ọchịchọ gị si dị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.