Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼezie dịka Onyenwe anyị, onye na-azọpụta Izrel na-adị ndụ, a sịkwarị na ọ bụ nwa m Jonatan ka a chọpụtara na ọ bụ ya ka ikpe mara, ọ ga-anwụ!” Ma ọ dịghị onye gwara ya ihe ọbụla.

1 Samuel 14:39 in English

1 Samuel 14:39 · Berean Standard Bible

As surely as the LORD who saves Israel lives, even if it is my son Jonathan, he must die!” But not one of the troops said a word.

Context

37Mgbe ahụ, Sọl jụrụ Chineke sị, “Ọ bụ m rịda gaa chụso ndị Filistia? Ị ga-enyefe ha nʼaka ndị Izrel?” Ma Chineke enyeghị ya ọsịsa ọbụla nʼụbọchị ahụ. 38Sọl gwara ndịisi agha Izrel okwu sị, “Ihe emebiela! Anyị aghaghị ịchọpụta ụdị mmehie anyị mere taa, nke mere Onyenwe anyị ji jụ inye anyị ọsịsa. 39Nʼezie dịka Onyenwe anyị, onye na-azọpụta Izrel na-adị ndụ, a sịkwarị na ọ bụ nwa m Jonatan ka a chọpụtara na ọ bụ ya ka ikpe mara, ọ ga-anwụ!” Ma ọ dịghị onye gwara ya ihe ọbụla. 40Mgbe ahụ, Sọl gwara ndị Izrel niile okwu sị ha, “Guzonụ onwe unu nʼebe ahụ, mụ na nwa m Jonatan ga-eguzo onwe anyị nʼebe a.” Ndị ahụ zara sị, “Mee ihe ọbụla dị gị mma.” 41Mgbe ahụ, Sọl kpere ekpere nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel, “Gịnị mere na ị zabeghị ohu gị taa? Ọ bụrụ na ikpe mara m maọbụ nwa m Jonatan, zaa site nʼUrim, ma ọ bụrụ ndị ikom Izrel ka ikpe mara,* nye ọsịsa site na Tumim.” Nza ahụ mara Jonatan na Sọl, ma ikpe amaghị ndị ikom Izrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.