Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ugbu a, alaeze gị agaghị adịgide. Onyenwe anyị achọpụtala otu nwoke dịka ọchịchọ obi ya si dị, ọ họpụtakwala ya ịbụ eze nke ndị ya; nʼihi na ị debeghị ihe Onyenwe anyị nyere gị nʼiwu.”

1 Samuel 13:14 in English

1 Samuel 13:14 · Berean Standard Bible

But now your kingdom will not endure; the LORD has sought a man after His own heart and appointed him ruler over His people, because you have not kept the command of the LORD.”

Context

12echeere m, ‘Ugbu a, ndị Filistia ga-arịdakwute m ibuso m agha na Gilgal, ma arịọbeghị m ihuọma Onyenwe anyị.’ Ya mere m, m jisie ike chụọ aja nsure ọkụ ahụ.” 13Samuel sịrị Sọl, “Ị kpara agwa onye nzuzu. I debeghị ihe Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu idebe. A si na i mere nke a, ọ gaara eme ka alaeze gị guzosie ike nʼebe Izrel nọ ruo mgbe niile. 14Ma ugbu a, alaeze gị agaghị adịgide. Onyenwe anyị achọpụtala otu nwoke dịka ọchịchọ obi ya si dị, ọ họpụtakwala ya ịbụ eze nke ndị ya; nʼihi na ị debeghị ihe Onyenwe anyị nyere gị nʼiwu.” 15Samuel biliri hapụ Gilgal gaa Gibea nʼala Benjamin. Mgbe Sọl gụrụ ndị agha so ya, ọ chọpụtara na ha dị naanị narị isii. 16Sọl na nwa ya nwoke Jonatan, na narị mmadụ isii ndị soo ha nọ na Geba nʼala Benjamin, ebe ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Mikmash.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.