Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

echeere m, ‘Ugbu a, ndị Filistia ga-arịdakwute m ibuso m agha na Gilgal, ma arịọbeghị m ihuọma Onyenwe anyị.’ Ya mere m, m jisie ike chụọ aja nsure ọkụ ahụ.”

1 Samuel 13:12 in English

1 Samuel 13:12 · Berean Standard Bible

I thought, ‘Now the Philistines will descend upon me at Gilgal, and I have not sought the favor of the LORD.’ So I felt compelled to offer the burnt offering.”

Context

10Ngwangwa ọ na-achụcha aja ndị ahụ, Samuel rutere, Sọl pụrụ izute ya, na ikele ya. 11Samuel sịrị, “Gịnị bụ ihe a i mere?” Sọl zara, “Mgbe m hụrụ na ndị a na-agba aghara aghara, na-esite nʼebe m nọ na-agbapụ, mgbe m lere anya lee, ma ahụghị m ka ị na-abịa dịka i kwuru, mgbe m hụkwara ndị Filistia ka ha nọ na Mikmash, na-akwado ibuso anyị agha, 12echeere m, ‘Ugbu a, ndị Filistia ga-arịdakwute m ibuso m agha na Gilgal, ma arịọbeghị m ihuọma Onyenwe anyị.’ Ya mere m, m jisie ike chụọ aja nsure ọkụ ahụ.” 13Samuel sịrị Sọl, “Ị kpara agwa onye nzuzu. I debeghị ihe Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu idebe. A si na i mere nke a, ọ gaara eme ka alaeze gị guzosie ike nʼebe Izrel nọ ruo mgbe niile. 14Ma ugbu a, alaeze gị agaghị adịgide. Onyenwe anyị achọpụtala otu nwoke dịka ọchịchọ obi ya si dị, ọ họpụtakwala ya ịbụ eze nke ndị ya; nʼihi na ị debeghị ihe Onyenwe anyị nyere gị nʼiwu.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.