Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Naanị tụọnụ egwu Onyenwe anyị, werekwanụ obi unu fee ya ofufe nʼikwesị ntụkwasị obi; chetanụ ihe ukwuu niile o meere unu.

1 Samuel 12:24 in English

1 Samuel 12:24 · Berean Standard Bible

Above all, fear the LORD and serve Him faithfully with all your heart; consider what great things He has done for you.

Context

22Onyenwe anyị agaghị ahapụ ndị ya ọ họpụtara, nʼihi na-ime ihe dị otu a bụ iwetara aha ya dị ukwuu ihere. Ọ tọrọ Onyenwe anyị ụtọ ime unu mba pụrụ iche nye onwe ya. 23Ma banyere mụ onwe m, ọ ga-abụrụ m ihe arụ ma a sị na m ga-emehie megide Onyenwe anyị site nʼịkwụsị ikpere unu ekpere. Aga m anọgidekwa na-ezi unu ihe ndị ahụ dị mma, na ihe ndị ahụ kwesiri ekwesi. 24Naanị tụọnụ egwu Onyenwe anyị, werekwanụ obi unu fee ya ofufe nʼikwesị ntụkwasị obi; chetanụ ihe ukwuu niile o meere unu. 25Ma ọ bụrụ na unu anọgide na-eme ihe ọjọọ, unu na eze unu ka a ga-ekpochapụ.” 12:3 Ọnụ 16:15; Ọrụ 20:33; 1Te 2:5; Ọpụ 23:8; Dit 16:19 12:10 Nkp 10:10 12:10 Nkp 2:13; 3:7 12:11 Nʼime akwụkwọ ụfọdụ ihe ị ga-ahụ bụ Bedan

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.