1 Samuel 12:17
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu maara na ugbu a bụ oge a na-aghọ mkpụrụ ọka wiiti, ma aga m ekpe ekpere ka Onyenwe anyị zite egbe eluigwe na mmiri ozuzo taa, ka unu ghọta ụdị ihe ọjọọ unu mere nʼanya Onyenwe anyị mgbe unu rịọrọ ya sị ya nye unu eze.”
1 Samuel 12:17 in English
1 Samuel 12:17 · Berean Standard Bible
Is it not the wheat harvest today? I will call on the LORD to send thunder and rain, so that you will know and see what a great evil you have committed in the sight of the LORD by asking for a king.”
Context
15Ma ọ bụrụ na unu enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị, jụ ige ya ntị, aka ya ga-abịakwasị unu nʼoke iwe, ọ ga-emekwa unu ihe o mere nna nna unu ha. 16“Ugbu a, na-elenụ anya ka unu hụ ọrụ ịtụnanya niile Onyenwe anyị na-aga ịrụ. 17Unu maara na ugbu a bụ oge a na-aghọ mkpụrụ ọka wiiti, ma aga m ekpe ekpere ka Onyenwe anyị zite egbe eluigwe na mmiri ozuzo taa, ka unu ghọta ụdị ihe ọjọọ unu mere nʼanya Onyenwe anyị mgbe unu rịọrọ ya sị ya nye unu eze.” 18Mgbe ahụ Samuel kpọkuru Onyenwe anyị, Onyenwe anyị zidatakwara egbe eluigwe na mmiri ozuzo nʼụbọchị ahụ. Nke a mere ka mmadụ niile tụọ Onyenwe anyị na Samuel egwu. 19Ndị ahụ rịọrọ Samuel arịrịọ sị ya, “Biko kpeere anyị ekpere nye Onyenwe anyị Chineke gị ka anyị bụ ndị ohu gị ghara ịnwụ. Nʼihi na, nʼezie, anyị ejirila aka anyị mee ka mmehie anyị mụbaa site nʼịrịọ ka e nye anyị eze.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.