Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Mgbe i ruru nʼosisi ukwu Taboa, ị ga-ezute ndị ikom atọ ndị na-aga ife Chineke ofufe na Betel. Otu nʼime ha ga-ebu ụmụ ewu atọ, nke ọzọ ga-eji ogbe achịcha atọ, ma nke atọ ga-eji otu karama mmanya.

1 Samuel 10:3 in English

1 Samuel 10:3 · Berean Standard Bible

Then you will go on from there until you come to the Oak * of Tabor. Three men going up to God at Bethel will meet you there, one carrying three young goats, another carrying three loaves of bread, and another carrying a skin of wine.

Context

1Mgbe ahụ, Samuel weere karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi, sutukwa ya ọnụ nʼagba sị ya, “Ọ bụ na Onyenwe anyị etebeghị gị mmanụ ime gị onyendu ihe nketa ya? 2Mgbe ị ga-ahapụ m nʼebe a, ị ga-ahụ ndị ikom abụọ nʼakụkụ ili Rechel na Zelza, nʼala Benjamin, ha ga-agwa gị, ‘A chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ugbu a, nna gị akwụsịla iche ihe gbasara ịnyịnya ibu ya, ma ọ nọkwa na-echegbu onwe ya nʼihi gị, ọ na-ajụ, “Olee ihe m ga-eme banyere ọkpara m?” ’ 3“Mgbe i ruru nʼosisi ukwu Taboa, ị ga-ezute ndị ikom atọ ndị na-aga ife Chineke ofufe na Betel. Otu nʼime ha ga-ebu ụmụ ewu atọ, nke ọzọ ga-eji ogbe achịcha atọ, ma nke atọ ga-eji otu karama mmanya. 4Ha ga-ajụ gị banyere ọdịmma gị, nyekwa gị ogbe achịcha abụọ, nke ị ga-anara site nʼaka ha. 5“Emesịa, ị ga-aga Gibea nke Chineke, ebe ndị agha ndị Filistia mara ụlọ ikwu nche. Mgbe ị na-abata obodo ahụ, ị ga-ezute ndị amụma, ndị si nʼebe dị elu ahụ na-arịdata. Ha ga na-akpọ une, na egwu otiti, na ọja, na ụbọ akwara. Ha ga na-ebukwa amụma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.