Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ị ga-ahapụ m nʼebe a, ị ga-ahụ ndị ikom abụọ nʼakụkụ ili Rechel na Zelza, nʼala Benjamin, ha ga-agwa gị, ‘A chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ugbu a, nna gị akwụsịla iche ihe gbasara ịnyịnya ibu ya, ma ọ nọkwa na-echegbu onwe ya nʼihi gị, ọ na-ajụ, “Olee ihe m ga-eme banyere ọkpara m?” ’

1 Samuel 10:2 in English

1 Samuel 10:2 · Berean Standard Bible

When you leave me today, you will find two men at Rachel’s tomb in Zelzah on the border of Benjamin. They will say to you, ‘The donkeys you seek have been found, and now your father has stopped worrying about the donkeys and started worrying about you, asking, “What should I do about my son?”’

Context

1Mgbe ahụ, Samuel weere karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi, sutukwa ya ọnụ nʼagba sị ya, “Ọ bụ na Onyenwe anyị etebeghị gị mmanụ ime gị onyendu ihe nketa ya? 2Mgbe ị ga-ahapụ m nʼebe a, ị ga-ahụ ndị ikom abụọ nʼakụkụ ili Rechel na Zelza, nʼala Benjamin, ha ga-agwa gị, ‘A chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ugbu a, nna gị akwụsịla iche ihe gbasara ịnyịnya ibu ya, ma ọ nọkwa na-echegbu onwe ya nʼihi gị, ọ na-ajụ, “Olee ihe m ga-eme banyere ọkpara m?” ’ 3“Mgbe i ruru nʼosisi ukwu Taboa, ị ga-ezute ndị ikom atọ ndị na-aga ife Chineke ofufe na Betel. Otu nʼime ha ga-ebu ụmụ ewu atọ, nke ọzọ ga-eji ogbe achịcha atọ, ma nke atọ ga-eji otu karama mmanya. 4Ha ga-ajụ gị banyere ọdịmma gị, nyekwa gị ogbe achịcha abụọ, nke ị ga-anara site nʼaka ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.