Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, Samuel kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile na Mizpa,* ka ha bịa zute Onyenwe anyị.

1 Samuel 10:17 in English

1 Samuel 10:17 · Berean Standard Bible

After this, Samuel summoned the people to the LORD at Mizpah

Context

15Ma nwanne nna Sọl sịrị, “Gwa m ihe Samuel gwara gị.” 16Sọl zara ya sị, “Ọ gwara anyị na a chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ.” Ma okwu gbasara alaeze, dịka Samuel siri kwuo ya, ọ gwaghị ya ihe ọbụla. 17Emesịa, Samuel kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile na Mizpa,* ka ha bịa zute Onyenwe anyị. 18Ọ gwara ha sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Mụ onwe m si nʼala Ijipt kpọpụta Izrel ma napụtakwa unu site nʼaka ike ndị Ijipt, na site nʼaka alaeze niile bụ ndị kpagburu unu.’ 19Ma ugbu a, unu ajụla Chineke unu onye na-azọpụta unu site nʼihe ndakwasị na nhụju anya unu niile. Unu kwukwara sị, ‘Mba, nye anyị eze ga-achị anyị.’ Ugbu a, doonụ onwe unu nʼusoro nʼihu Onyenwe anyị dịka ebo unu na ikwu unu niile si dị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.