1 Samuel 1:4
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ọbụla Elkena na-achụ aja ya, ọ na-ekenye Penina na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom ọtụtụ oke site nʼanụ o ji chụọ aja.
1 Samuel 1:4 in English
1 Samuel 1:4 · Berean Standard Bible
And whenever the day came for Elkanah to present his sacrifice, he would give portions to his wife Peninnah and to all her sons and daughters.
Context
2Elkena lụrụ ndị inyom abụọ, aha nke mbụ bụ Hana, ebe aha nke abụọ bụ Penina. Penina nwere ụmụ, ma Hana enweghị nwa. 3Kwa afọ, nwoke a na-esi nʼobodo ya gaa Shaịlo ife ofufe na ịchụrụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile aja. Ọ bụ nʼebe ahụ ka ụmụ ndị ikom abụọ Elayị a na-akpọ Hofni na Finehaz, bụ ndị nchụaja Onyenwe anyị nọ.* 4Nʼụbọchị ọbụla Elkena na-achụ aja ya, ọ na-ekenye Penina na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom ọtụtụ oke site nʼanụ o ji chụọ aja. 5Ma ọ na-enye Hana oke mmadụ abụọ, nʼihi na ọ hụrụ ya nʼanya, ọ bụ ezie na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ya. 6Ma Penina na-eme ka obi jọọ Hana njọ karịa, site nʼikpasu ya iwe, nʼihi na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.