1 Samuel 1:11
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O kwere nkwa sị, “O! Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụrụ na ị ga-elekwasị anya na nhụju anya nke ohu gị nwanyị ma cheta m, ghara ichefu ohu gị nwanyị, ma nye ya nwa nwoke, mgbe ahụ, aga m enyeghachi ya Onyenwe anyị ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya. Agụba agakwaghị aga nʼisi ya mgbe ọbụla.”
1 Samuel 1:11 in English
1 Samuel 1:11 · Berean Standard Bible
And she made a vow, pleading, “O LORD of Hosts, if only You will look upon the affliction of Your maidservant and remember me, not forgetting Your maidservant but giving her a son, then I will dedicate him to the LORD all the days of his life, and no razor shall ever come over his head.”
Context
9Otu ụbọchị mgbe ha risiri nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ na Shaịlo, Hana biliri ọtọ. Nʼoge a, Elayị onye nchụaja nọdụrụ ala nʼoche ya nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọ Onyenwe anyị. 10Nʼọnọdụ obi mwute Hana kwara akwa, kpee ekpere, kpọkuo Onyenwe anyị. 11O kwere nkwa sị, “O! Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụrụ na ị ga-elekwasị anya na nhụju anya nke ohu gị nwanyị ma cheta m, ghara ichefu ohu gị nwanyị, ma nye ya nwa nwoke, mgbe ahụ, aga m enyeghachi ya Onyenwe anyị ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya. Agụba agakwaghị aga nʼisi ya mgbe ọbụla.” 12Mgbe ọ nọgidere na-ekpe ekpere nye Onyenwe anyị, Elayị nọ na-ele ya anya nʼọnụ. 13Ka Hana nọ na-ekpe ekpere nʼobi ya, naanị egbugbere ọnụ ya na-emegharị emegharị, ma enweghị onye na-anụ olu ya. Mgbe ahụ, Elayị chere nʼobi ya na ọ bụ nwanyị mmanya na-egbu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.