Native Bible

1 Peter 2:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼelu obe ahụ, o buuru mmehie anyị niile bokwasị onwe ya mgbe ọ nwụrụ, ime ka anyị nwee ike ịbụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị; ma dịrị ndụ nʼebe ezi omume dị. Ọ bụkwa site nʼapa ọnya dị ya nʼahụ ka o ji gwọọ unu.*

1 Peter 2:24 in English

1 Peter 2:24 · Berean Standard Bible

He Himself bore our sins * in His body on the tree, so that we might die to sin and live to righteousness. “By His stripes you are healed.”*

Context

22“O nweghị mgbe ọbụla o mehiere, o nwekwaghị mgbe onye ọbụla nụrụ okwu aghụghọ nʼọnụ ya.”* 23O kwutọghị onye ọbụla mgbe ha na-ekwutọ ya. Ọ baghị mba ọbụla mgbe ha na-ata ya ahụhụ, kama o were ya nyefee nʼaka onye ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi. 24Nʼelu obe ahụ, o buuru mmehie anyị niile bokwasị onwe ya mgbe ọ nwụrụ, ime ka anyị nwee ike ịbụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị; ma dịrị ndụ nʼebe ezi omume dị. Ọ bụkwa site nʼapa ọnya dị ya nʼahụ ka o ji gwọọ unu.* 25Na mbụ, unu dị ka ụmụ atụrụ na-awagharị na-achọ ụzọ,* ma ugbu a, e meela ka unu laghachikwute Onye ahụ na-azụ unu dị ka atụrụ, na Onye na-elekọtakwa mkpụrụobi unu anya. 2:6 Aịz 28:16 2:7 Abụ 118:22 2:8 Aịz 8:14 2:22 Aịz 53:9 2:24 Aịz 53:5 2:25 Aịz 53:6

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.