1 Ndị Eze 9:26
1 Kings 9:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eze Solomọn wukwara ọtụtụ ụgbọ mmiri nʼEziọn Geba,* bụ nke dị nʼakụkụ Elat, nʼọnụ mmiri Oke osimiri Uhie nʼala Edọm.
1 Kings 9:26 in English
1 Kings 9:26 · Berean Standard Bible
King Solomon also assembled a fleet of ships at Ezion-geber, which is near Eloth * in Edom, on the shore of the Red Sea.*
Context
24Emesịa, ada Fero sitere nʼobodo Devid pụta gbagoo nʼụlọeze nke Solomọn wuuru ya. Solomọn wukwara ebe mpụta nke ụlọ ahụ. 25Ugboro atọ nʼafọ,* ka Solomọn na-achụ aja nsure ọkụ, na aja udo nʼelu ebe ịchụ aja o wuru nye Onyenwe anyị, tinyere aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ ọ na-achụ nʼihu Onyenwe anyị. O si otu a wuchaa ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 26Eze Solomọn wukwara ọtụtụ ụgbọ mmiri nʼEziọn Geba,* bụ nke dị nʼakụkụ Elat, nʼọnụ mmiri Oke osimiri Uhie nʼala Edọm. 27Hiram zigaara ndị ikom ya na-anya ụgbọ, ndị maara ihe banyere ime njem osimiri nke ọma, ka ha soro ndị ikom Solomọn jee ozi nʼime ụgbọ ndị a. 28Ha nyaara ụgbọ gaa Ọfịa,* site nʼebe ahụ bulatara eze Solomọn ọlaedo nke ịdị arọ ya ruru puku kilogram iri na anọ na narị abụọ na asatọ.
9:2 1Ez 3:5; 11:9; 2Ih 1:7
9:13 Ala na-adịghị ihe ọ dị mma iji ya mee.
9:18 Maọbụ, Tama nʼasụsụ ndị Hibru
9:25 Ọ bụ nʼusoro ụzọ mmemme atọ dị mkpa nke ndị Izrel na-eme kwa afọ. Ndị a bụ mmemme achịcha ekoghị eko, mmemme owuwe ihe ubi, na mmemme ibi ụlọ ikwu. Ọpụ 23:14-17; Dit 16:16; 2Ih 8:13
9:26 Obodo Eziọn Geba dị nʼakụkụ Elat nʼala Edọm, baara Solomọn uru nʼebe ọ dị ukwu nʼihi osimiri Uhie na oke osimiri India dị ya nso. Ọnụ 33:35; Dit 2:8; 1Ez 22:48
9:28 Ọtụtụ mmadụ na-ama atụ ebe a ga-enwe ike chọta obodo Ọfịa taa. Ụfọdụ na-asị, na ọ bụ nʼọnụ mmiri Arebịa ka ọ dị, ndị ọzọ na-asị, ọ bụ na mpaghara akụkụ ọnụ mmiri Sọmalia. Ebe ndị ọzọ na-asị, na ọ dị nʼala India maọbụ nʼala Zimbabwe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.